22 N'ihi na mb͕e ahu ha nābiakute Devid kwa-ubọchi iyere ya aka, rue mb͕e ọ bu ọmuma-ulo-ikwū, dika ọmuma-ulo-ikwū Chineke.
23 Ndia bu kwa ọnu-ọgugu ndi-isi nke ndi ejikere iso usu-ndi-agha; ha biakutere Devid nime Hebron ichighari ala-eze Sọl nye ya, dika okwu-ọnu Jehova si di.
24 Umu Juda ndi nēbu ọta na ube di nnù iri-na-asa, ndi ejikere iso usu-ndi-agha.
25 Site n'umu Simeon, ndi-dike bu dìnkpà iso usu-ndi-agha, nnù iri-na-asa na ọgu iri-na-ise.
26 Site n'umu Livai, nnù iri-na-otù na ọgu iri.
27 Jehoiada bu onye-ndú ndi Eron, nnù ndikom iteghete na ọgu ise so-kwa-ra ya;
28 na Zedok, bú nwa-okorọbia nke bu dike bu dìnkpà, na nke ulo nna-ya orú ndi-isi na abua.