24 Umu Juda ndi nēbu ọta na ube di nnù iri-na-asa, ndi ejikere iso usu-ndi-agha.
25 Site n'umu Simeon, ndi-dike bu dìnkpà iso usu-ndi-agha, nnù iri-na-asa na ọgu iri-na-ise.
26 Site n'umu Livai, nnù iri-na-otù na ọgu iri.
27 Jehoiada bu onye-ndú ndi Eron, nnù ndikom iteghete na ọgu ise so-kwa-ra ya;
28 na Zedok, bú nwa-okorọbia nke bu dike bu dìnkpà, na nke ulo nna-ya orú ndi-isi na abua.
29 Site kwa n'umu Benjamin, bú umu-nne Sọl, nnù asa na ọgu iri: n'ihi na rue mb͕e ahu ndi ka n'ọnu-ọgugu nime ha nēdebe ihe-ndebe ulo Sọl.
30 Site kwa n'umu Efraim, orú nnù uzọ abua na nnù iri-na-abua, ha bu ndi-dike bu dìnkpà, ndikom amara aha-ha n'ulo nke ndi bu nna-ha.