3 Onye-isi bu Ahieza, na Joash, bú umu Shemaa onye Gibea; na Jeziel, na Pelet, bú umu Azmavet; na Beraka, na Jihu onye Anatot;
4 na Ishmaia onye Gibeon, bú dike n'etiti orú ndikom na iri ahu, na onye-isi orú na iri ahu; na Jeremaia, na Jahaziel, na Johanan, na Jozabad onye Gedira;
5 Eluzai, na Jerimot, na Bealia, na Shemaraia, na Shefataia onye-Harufait;
6 Elkena, na Ishia, na Azarel, na Joeza, na Jashọbeam, bú ndi Kora;
7 na Joela, na Zebadaia, bú umu Jeroham nke Gedoa.
8 Ufọdu nime ndi Gad kewaputa-kwa-ra onwe-ha jekuru Devid rue ebe ahu ewusiri ike n'ọzara, ndi-dike bu dìnkpà, ndikom usu-ndi-agha ibu agha, ndi nēdo ọta na ube n'usoro; iru-ha bu kwa iru ọdum, ha di kwa ngwa dika mb͕ada n'elu ugwu;
9 Iza, bú onye-isi, Obadaia, bú nke-abua, Elaiab, bú nke-atọ;