6 Elkena, na Ishia, na Azarel, na Joeza, na Jashọbeam, bú ndi Kora;
7 na Joela, na Zebadaia, bú umu Jeroham nke Gedoa.
8 Ufọdu nime ndi Gad kewaputa-kwa-ra onwe-ha jekuru Devid rue ebe ahu ewusiri ike n'ọzara, ndi-dike bu dìnkpà, ndikom usu-ndi-agha ibu agha, ndi nēdo ọta na ube n'usoro; iru-ha bu kwa iru ọdum, ha di kwa ngwa dika mb͕ada n'elu ugwu;
9 Iza, bú onye-isi, Obadaia, bú nke-abua, Elaiab, bú nke-atọ;
10 Mishmana, bú nke-ano, Jeremaia, bú nke-ise;
11 Atai, bú nke-isi, Eliel, bú nke-asa;
12 Johanan, bú nke-asatọ, Elzabad, bú nke-iteghete;