8 Ufọdu nime ndi Gad kewaputa-kwa-ra onwe-ha jekuru Devid rue ebe ahu ewusiri ike n'ọzara, ndi-dike bu dìnkpà, ndikom usu-ndi-agha ibu agha, ndi nēdo ọta na ube n'usoro; iru-ha bu kwa iru ọdum, ha di kwa ngwa dika mb͕ada n'elu ugwu;
9 Iza, bú onye-isi, Obadaia, bú nke-abua, Elaiab, bú nke-atọ;
10 Mishmana, bú nke-ano, Jeremaia, bú nke-ise;
11 Atai, bú nke-isi, Eliel, bú nke-asa;
12 Johanan, bú nke-asatọ, Elzabad, bú nke-iteghete;
13 Jeremaia, bú nke-iri, Makbanai, bú nke-iri-na-otù.
14 Ndia, ndi sitere n'umu Gad, bu ndi-isi usu-ndi-agha: onye kachasi ntà ra ka ọgu ndikom ise, onye kachasi uku ra kwa ka nnù ndikom abua na ọgu iri.