1 Devid we me ka ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na usu nile nke ọgu ndikom ise dua ya ọdu, bú onye-ndú ọ bula.
2 Devid we si nkpọkọta nile nke Israel, Ọ buru na ọ di unu nma, ọ buru kwa na o sitere na Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi zisara umu-nne-ayi ozi n'ebe nile, bú ndi fọduru n'ala nile nke Israel, ha na ndi-nchu-àjà na ndi Livai ndi bi n'obodo ebe-ita-nri nile ha, ka ha we chikọta onwe-ha n'ebe ayi nọ:
3 ka ayi bughachi kwa ib͕e Chineke-ayi n'ebe ayi nọ: n'ihi na ayi achọghi ya n'ubọchi Sọl.
4 Nkpọkọta ahu nile we si na ha gēme otú a: n'ihi na okwu ahu ziri ezi n'anya ndi Israel nile.
5 Devid we kpọkọta Israel nile, site na Shaihoa nke Egypt we rue nbata Hemat, ime ka ib͕e Chineke si na Kiriat-jearim bia.