3 ka ayi bughachi kwa ib͕e Chineke-ayi n'ebe ayi nọ: n'ihi na ayi achọghi ya n'ubọchi Sọl.
4 Nkpọkọta ahu nile we si na ha gēme otú a: n'ihi na okwu ahu ziri ezi n'anya ndi Israel nile.
5 Devid we kpọkọta Israel nile, site na Shaihoa nke Egypt we rue nbata Hemat, ime ka ib͕e Chineke si na Kiriat-jearim bia.
6 Devid we rigo, ya na Israel nile, rue Beala, rue Kiriat-jearim, nke Juda nwere, isi n'ebe ahu bugota ib͕e Chineke, bú Jehova, Onye nānọkwasi cherubim, nke akpọkwasiri Aha ahu.
7 Ha we me ka ub͕ọ-ala ọhu būru ib͕e Chineke, ha we buputa ya n'ulo Abinadab: Uza na Ahio we nēdu ub͕ọ-ala ahu.
8 Devid na Israel nile nēwere ike-ha nile gba egwú n'iru Chineke, were kwa abù, were kwa ubọ-akwara, na une, na egwú-otiti, na ájà, na opì.
9 Ha we biarue ebe-nzọcha-ọka Kidon, Uza we setia aka-ya ijide ib͕e ahu; n'ihi na ehi nāb͕a ukwu.