4 Ndia bu kwa aha umu o nwere na Jerusalem; Shamua, na Shobab, na Netan, na Solomon;
5 na Ibha, na Elishua, na Elpelet;
6 na Noga, na Nefeg, na Jafia;
7 na Elishama, na Beeliada, na Elifelet.
8 Ndi Filistia we nu na etere Devid manu ibu eze Israel nile, ndi Filistia nile we rigo ichọ Devid: Devid we nu ya, we pua n'iru ha.
9 Ma ndi Filistia biara, nọdu na ndagwurugwu Refaim.
10 Devid we jua Chineke ase, si, M'gārigo imegide ndi Filistia? Ì gēnye kwa ha n'akam? Jehova we si ya, Rigo; M'gēnye kwa ha n'aka-gi.