20 na Zekaraia, na Aziel, na Shemiramot, na Jehiel, na Uni, na Elaiab, na Maaseia, na Benaia, chiri une nke dabàra n'olu umu-ab͕ọghọ;
21 na Matitaia, na Elifelehu, na Mikneia, na Obed-edom, na Jeiel, na Azazaia, chiri ubọ-akwara nke dabàra n'octave, ibu ndi-isi nke ndi-abù.
22 Ma Kenania, bú onye-isi ndi Livai, bu isi n'ibū ibu ahu: ọ dọrọ aka na nti n'ibū ibu ahu, n'ihi na onye nwere nghọta ka ọ bu.
23 Berekaia na Elkena bu ndi-ọnu-uzọ-ama diri ib͕e ahu.
24 Shebania, na Joshafat, na Netanel, na Amasai, na Zekaraia, na Benaia, na Elieza, bú ndi-nchu-àjà, nāfù opì n'iru ib͕e Chineke: Obed-edom na Jehia bu ndi-ọnu-uzọ-ama diri ib͕e ahu.
25 Devid, na ndi-okenye Israel, na ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri, we nēje iwere ọṅù si n'ulo Obed-edom bugota ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova:
26 o rue, mb͕e Chineke yere ndi Livai ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova aka, na ha churu oke-ehi asa na ebulu asa n'àjà.