2 Devid we surebìe àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile, gọzie ndi Israel n'aha Jehova.
3 Ọ we kesara madu ọ bula n'Israel, ma nwoke ma nwayi, madu ọ bula, otù ob͕e achicha, na otù ọkpurukpu anu, na otù mbadamba nkpuru-vine amiri ami.
4 O we tiye ufọdu nime ndi Livai n'iru ib͕e Jehova, bú ndi nēje ozi, ọbuná ime ka echeta na ikele na ito Jehova, bú Chineke Israel:
5 ha bu: Esaf, bú onye-isi, na Zekaraia, bú onye nke-abua ya, na Jeiel, na Shemiramot, na Jehiel, na Matitaia, na Elaiab, na Benaia, na Obede-edom, na Jeiel, chiri une na ubọ-akwara; Esaf nēwere kwa ájà me ka anu udà-ha;
6 Benaia na Jehaziel, bú ndi-nchu-àjà, nāchiri kwa opì mb͕e nile, n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke.
7 Mb͕e ahu, n'ubọchi ahu, Devid buru uzọ nye iwu ikele Jehova, site n'aka Esaf na umu-nne-ya.
8 Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya;Menu ka amara omume-Ya nile n'etiti ndi nile n'uwa.