1 Ndia bu umu-ndikom Israel; Reuben, Simeon, Livai, na Juda, Isaka na Zebulun;
2 Dan, Josef na Benjamin, Naftali, Gad na Asha.
3 Umu-ndikom Juda kwa; Ia, na Onan, na Shila: umu atọ ndia ka Bat-shua, bú nwayi Kenean, muru nye ya. Ma Ia, bú ọkpara Juda, jọrọ njọ n'anya Jehova; O we me ka ọ nwua.
4 Tema, bú nwunye nwa-ya, we muara ya Perez na Zera. Umu-ndikom nile nke Juda di ise.