16 Umu-nne-ha ndinyom bu Zeruaia na Abigail. Umu-ndikom Zeruaia kwa; Abishai, na Joab, na Asahel, atọ.
17 Abigail mu-kwa-ra Amasa: ma nna Amasa bu Jeta onye Ishmael.
18 Keleb nwa Hezron muru umu site n'Azuba, bú nwunye-ya, site kwa na Jeriot: ndia bu umu-ndikom nwayi ahu; Jesha, na Shobab, na Adon.
19 Azuba we nwua, Keleb we lutara onwe-ya Efrat, o we muara ya Hua.
20 Hua mua Uri, Uri mua Bezalel.
21 Emesia Hezron bakuru nwa-nwayi Makia, bú nna Gilead; ma nwoke ahu lutara ya mb͕e ya onwe-ya b͕ara ọgu arọ atọ; o we muara ya Segub.
22 Segub we mua Jaia, nke nwere orú obodo na atọ n'ala Gilead.