4 Tema, bú nwunye nwa-ya, we muara ya Perez na Zera. Umu-ndikom nile nke Juda di ise.
5 Umu-ndikom Perez; Hezron na Hamul.
6 Umu-ndikom Zera kwa; Zimri, na Itan, na Himan, na Kalkol, na Dara: ha nile di ise.
7 Umu-ndikom Kami kwa; Eka, bú onye nēmekpa Israel aru, onye mekpuru ihe-nmekpu n'ihe ewezugara nye Jehova.
8 Umu-ndikom Itan kwa; Azaraia.
9 Umu-ndikom Hezron kwa, ndi amuru nye ya; Jerahmeel, na Ram, na Kelubai.
10 Ram we mua Aminadab; Aminadab mua Nahshon, bú onye-isi umu Juda: