12 ma ọ bu oké unwu arọ atọ; ma-ọbu ka ekpochapu gi ọnwa atọ n'iru ndi nākpab͕u gi, ọbuná mma-agha ndi-iro-gi nēru gi aru; ma-ọbu mma-agha Jehova ubọchi atọ, bú ajọ ọria nēfe efe n'ala, mọ-ozi nke Jehova nēbibi kwa n'ókè-ala nile nke Israel. Ma ub͕u a le okwu m'gēweghachiri Onye nēzitem.
13 Devid we si Gad, Anọm na nkpà nke-uku: biko ka m'dabà n'aka Jehova; n'ihi na obi-ebere-Ya bara uba nke-uku: ma ka m'ghara idabà n'aka madu.
14 Jehova we tiye ajọ ọria nēfe efe n'aru Israel: orú nnù ndikom uzọ asatọ na nnù iri-na-ise we dapu n'Israel.
15 Chineke we ziga mọ-ozi na Jerusalem ibibi ya: ma mb͕e ọ gaje ibibi, Jehova huru, we chègharia n'ihe ọjọ ahu, we si mọ-ozi ahu nke nēbibi, O zuwo; ub͕u a ra aka-gi. Ma mọ-ozi nke Jehova nēguzo n'akuku ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus.
16 Devid we welie anya-ya, hu mọ-ozi nke Jehova, ka o nēguzo n'etiti ala na elu-igwe, ya na mma-agha-ya amiputara amiputa n'aka-ya, nke esetiri n'elu Jerusalem. Devid na ndi-okenye we kpuru ákwà-nkpe da kpuchie iru-ha n'ala.
17 Devid we si Chineke, Ọ̀ bughi mu onwem siri ka aguta ndi Israel? ọbuná mu onwem ka ọ bu, bú onye mehieworo, me kwa ihe ọjọ nke-uku; ma ìgwè aturu ndia, gini ka ha mere? biko, Jehova, bú Chinekem, ka aka-Gi digidem, digide kwa ulo nnam; ma ka ọ ghara idigide ndi-Gi, ka etie ha ihe-otiti.
18 Mọ-ozi nke Jehova we si Gad ka ọ si Devid ka Devid rigo, me ka ebe-ichu-àjà guzoro Jehova n'ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus.