17 Devid we si Chineke, Ọ̀ bughi mu onwem siri ka aguta ndi Israel? ọbuná mu onwem ka ọ bu, bú onye mehieworo, me kwa ihe ọjọ nke-uku; ma ìgwè aturu ndia, gini ka ha mere? biko, Jehova, bú Chinekem, ka aka-Gi digidem, digide kwa ulo nnam; ma ka ọ ghara idigide ndi-Gi, ka etie ha ihe-otiti.
18 Mọ-ozi nke Jehova we si Gad ka ọ si Devid ka Devid rigo, me ka ebe-ichu-àjà guzoro Jehova n'ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus.
19 Devid we rigo n'okwu Gad nke o kwuru n'aha Jehova.
20 Ọnan we chigharia, hu mọ-ozi ahu; umu-ya ndikom anọ ndi ya na ha nọ we nēzo onwe-ha. Ma Ọnan nāzọcha ọka wheat.
21 Devid we biakute Ọnan, Ọnan we legide anya, hu Devid, si n'ebe-nzọcha-ọka-ya puta, kpọ isi ala nye Devid, kpuchie iru-ya n'ala.
22 Devid we si Ọnan, Nyem ebe a, bú ebe-nzọcha-ọka nka, ka m'we wuere Jehova ebe-ichu-àjà nime ya: n'ego zuru ezu o ruru ka i gēnyem ya: ka ewe b͕ochie ihe-otiti a n'ebe ndi Israel nọ.
23 Ọnan we si Devid, Were ya n'onwe-gi, ka onye-nwem, bú eze, me kwa ihe di nma n'anya-ya: le, enyewom gi ehi iji chu àjà-nsure-ọku, na ihe nzọcha-ọka ka ha buru nkú, na ọka wheat ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma; ihe nile ka m'nyeworo.