1 Devid we si, Nka bu ulo Jehova, bú Chineke, nka bu-kwa-ra Israel ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku.
2 Devid we si ka achikọta ndi-ọbìa ndi nọ n'ala Israel; o we guzo ndi nāwa nkume iwa nkume awaputara awaputa iwu ulo Chineke.
3 Devid dozi-kwa-ra ígwè riri nne ikpuru ibo ọnu-uzọ-ama nile ǹtú, na ikpu ihe-njikọta nile; na ọla riri nne nke anātùghi atù;
4 na osisi cedar nādighi ọnu-ọgugu: n'ihi na ndi Zaidon na ndi Taia butere osisi cedar riri nne nye Devid.
5 Devid we si, Solomon nwam bu nwata di kwa nrò, ma ulo ahu agēwuru Jehova, aghaghi ime ya ka ọ di uku kachasi ulo nile, ibu aha na ibu ihe mara nma diri ala nile: biko, ka m'doziere ya. Devid we dozie ri nne tutu ọ nwua.
6 O we kpọ Solomon, bú nwa-ya, nye ya iwu iwuru Jehova, bú Chineke Israel, ulo.