6 Devid we kè ha n'òkè, n'òkè, dika umu Livai si di; bú Giashon na Kohat, na Merari.
7 Nke ndi Giashon; Ladan na Shimai.
8 Umu-ndikom Ladan; onye-isi bu Jehiel, na Zitam, na Joel, atọ.
9 Umu-ndikom Shimai; Shel-omot, na Haziel, na Haran, atọ. Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna umu Ladan.
10 Umu-ndikom Shimai kwa; Jahat, na Zina, na Jeush, na Beria. Anọ ndia bu umu Shimai.
11 Jahat bu onye-isi, Ziza bu kwa nke-abua: ma Jeush na Beria enweghi ọtutu umu-ndikom; ha we ghọ otù ulo nna site n'igukọta ha n'otù.
12 Umu-ndikom Kohat; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel, anọ.