5 Ewe kè ha n'ife-nzà, ndi Eleeza na ndi Itama n'otù; n'ihi na ndi-isi ebe nsọ di, na ndi-isi nke Chineke, ndi sitere n'umu Eleeza na n'etiti umu Itama.
6 Shemaia nwa Netanel, bú ode-akwukwọ, onye sitere na ndi Livai, we de ha n'akwukwọ n'iru eze, na ndi-isi, na Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Ahimelek nwa Abaiata, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai: otù ulo nna nke Eleeza ka ejidere, ejide-kwa-ra otù nke Itama.
7 Ife-nzà mbu we putara Jehoiarib, nke-abua putara Jedaia;
8 nke-atọ putara Harim, nke-anọ putara Seorim;
9 nke-ise putara Malkija, nke-isi putara Mijamin;
10 nke-asa putara Hakoz, nke-asatọ putara Abaija;
11 nke-iteghete putara Jeshua, nke-iri putara Shekania;