5 ndia nile bu umu-ndikom Himan, bú onye-ọhu-uzọ eze n'okwu Chineke, iweli mpi elu. Chineke we nye Himan umu-ndikom iri na anọ na umu-ndinyom atọ.
6 Ndia nile nọ n'aka nna-ha n'ibù abù n'ulo Jehova, chiri ájà, na une, na ubọ-akwara, iji fè òfùfè nke ulo Chineke; ha nọ n'aka eze, bú Esaf, na Jedutun, na Himan.
7 Ọnu-ọgugu-ha, tiyere umu-nne-ha, ndi ezíworo abù anābùku Jehova, bú ndi nile nwere nghọta, di ọgu iri-na-anọ na asatọ.
8 Ha we fe nzà bayere ihe-ndebe-ha, ha nile n'otù aka ahu, ma onye ntà ma onye uku, onye nwere nghọta tiyere onye anēzí ihe.
9 Ife-nzà mbu nke putara Esaf mara Josef: nke-abua mara Gedalia; ya onwe-ya na umu-nne-ya na umu-ya ndikom di iri na abua:
10 nke-atọ mara Zakua, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
11 nke anọ mara Izri, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua: