8 Ha we fe nzà bayere ihe-ndebe-ha, ha nile n'otù aka ahu, ma onye ntà ma onye uku, onye nwere nghọta tiyere onye anēzí ihe.
9 Ife-nzà mbu nke putara Esaf mara Josef: nke-abua mara Gedalia; ya onwe-ya na umu-nne-ya na umu-ya ndikom di iri na abua:
10 nke-atọ mara Zakua, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
11 nke anọ mara Izri, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
12 nke-ise mara Netanaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
13 nke-isi mara Bukia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:
14 nke-asa mara Jesharela, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua: