1 Bayere òkè nile nke ndi-ọnu-uzọ: nke ndi Kora; Meshelemaia nwa Kore, nke sitere n'umu Esaf.
2 Meshelemaia nwe-kwa-ra umu-ndikom; Zekaraia, bú ọkpara, na Jediael, bú nke-abua, na Zebadaia, bú nke-atọ, na Jatniel, bú nke-anọ;
3 na Ilam, bú nke-ise, na Jehohanam, bú nke-isi, na Eliehoenai, bú nke-asa.
4 Obed-edom nwe-kwa-ra umu-ndikom, Shemaia, bú ọkpara, na Jehozabad, bú nke-abua, na Joa, bú nke-atọ, na Saka, bú nke-anọ, na Netanel, bú nke-ise;
5 na Amiel, bú nke-isi, na Isaka, bú nke-asa, na Peuletai, bú nke-asatọ: n'ihi na Chineke gọziri ya.
6 Amu-kwa-ra umu-ndikom nye Shemaia nwa-ya, ndi nāchi ulo nna-ha: n'ihi na ndi-dike bu dìnkpà ka ha bu.
7 Umu-ndikom Shemaia; Ọtni, na Refael, na Obed, na Elzabad, umu-nne-ya bu ndi-dìnkpà, Elaihu, na Semakaia.