13 Ha we fe nzà, ma onye ntà ma onye uku, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, bayere ọnu-uzọ-ama ọ bula.
14 Ife-nzà n'akuku ọwuwa-anyanwu we ma Shelemaia. Ha fe-kwa-ra nzà bayere Zekaraia nwa-ya, bú onye nādu ọdu nke nwere uche; ife-nzà-ya we puta n'akuku Ugwu.
15 Ife-nzà nke Obed-edom putara n'akuku Ndida; nke umu-ya ndikom puta-kwa-ra n'ulo nchikọta-ihe.
16 Nke Shupim na nke Hosa putara n'Ọdida-anyanwu, n'akuku ọnu-uzọ-ama Shaleket, n'uzọ atuliri atuli nke nārigo, otù ihe-ndebe nēcherita ihe-ndebe ọzọ iru.
17 Ndi Livai isi nọ n'akuku ọwuwa-anyanwu, n'akuku Ugwu ha di anọ kwa-ubọchi, n'akuku Ndida ha di anọ kwa-ubọchi, ha di-kwa-ra ulo nchikọbata-ihe abua abua kwa-ubọchi.
18 N'èzí ulo n'akuku Ọdida-anyanwu ha di anọ n'uzọ atuliri atuli, abua n'èzí ulo.
19 Ndia bu òkè ndi-ọnu-uzọ-ama; nke umu ndi Kora, na nke umu Merari.