15 Ife-nzà nke Obed-edom putara n'akuku Ndida; nke umu-ya ndikom puta-kwa-ra n'ulo nchikọta-ihe.
16 Nke Shupim na nke Hosa putara n'Ọdida-anyanwu, n'akuku ọnu-uzọ-ama Shaleket, n'uzọ atuliri atuli nke nārigo, otù ihe-ndebe nēcherita ihe-ndebe ọzọ iru.
17 Ndi Livai isi nọ n'akuku ọwuwa-anyanwu, n'akuku Ugwu ha di anọ kwa-ubọchi, n'akuku Ndida ha di anọ kwa-ubọchi, ha di-kwa-ra ulo nchikọbata-ihe abua abua kwa-ubọchi.
18 N'èzí ulo n'akuku Ọdida-anyanwu ha di anọ n'uzọ atuliri atuli, abua n'èzí ulo.
19 Ndia bu òkè ndi-ọnu-uzọ-ama; nke umu ndi Kora, na nke umu Merari.
20 Nime ndi Livai, Ahaija bu onye-isi ulo-àkù nile nke ulo Chineke, ọbuná idebe ulo-àkù nile nke ihe nsọ nile.
21 Umu-ndikom Ladan; umu ndi Giashon, bú ndi Ladan nwere, ndi-isi ulo nke ndi bu nna ndi Ladan onye Giashon nwere; Jehieli.