18 N'èzí ulo n'akuku Ọdida-anyanwu ha di anọ n'uzọ atuliri atuli, abua n'èzí ulo.
19 Ndia bu òkè ndi-ọnu-uzọ-ama; nke umu ndi Kora, na nke umu Merari.
20 Nime ndi Livai, Ahaija bu onye-isi ulo-àkù nile nke ulo Chineke, ọbuná idebe ulo-àkù nile nke ihe nsọ nile.
21 Umu-ndikom Ladan; umu ndi Giashon, bú ndi Ladan nwere, ndi-isi ulo nke ndi bu nna ndi Ladan onye Giashon nwere; Jehieli.
22 Umu-ndikom Jehieli; Zitam, na Joel nwa-nne-ya, bú ndi-isi ulo-àkù nile nke ulo Jehova.
23 Nke ndi Amram, nke ndi Izha, nke ndi Hebron, nke ndi Uziel:
24 Shebuel nwa Giashon, nwa Moses, bu kwa onye-isi ulo-àkù nile.