7 Umu-ndikom Shemaia; Ọtni, na Refael, na Obed, na Elzabad, umu-nne-ya bu ndi-dìnkpà, Elaihu, na Semakaia.
8 Ndia nile sitere n'umu Obed-edom: ha onwe-ha na umu-ha ndikom na umu-nne-ha, ndikom bu dìnkpà n'ike ifè òfùfè; ọgu ndikom atọ na abua nke Obed-edom nwere.
9 Meshelemaia nwe-kwa-ra umu-ndikom na umu-nne, ndi-dìnkpà, iri na asatọ.
10 Hosa, onye sitere n'umu Merari, nwe-kwa-ra umu-ndikom; Shimri bú onye-isi, (n'ihi na ọ bu ezie na ọ bughi ọkpara, ma nna-ya mere ya onye-isi;)
11 na Hilkaia, bú nke-abua, na Tebalia, bú nke-atọ, na Zekaraia, bú nke-anọ: umu-ndikom na umu-nne nile nke Hosa nwere di iri na atọ.
12 Nke ndia ka òkè nile nke ndi-ọnu-uzọ-ama bu, bú nke ndi-isi nke ndi di ike nwere ihe-ndebe ọbuná dika umu-nne-ha, ije ozi n'ulo Jehova.
13 Ha we fe nzà, ma onye ntà ma onye uku, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, bayere ọnu-uzọ-ama ọ bula.