26 onye-isi ndi nēje ozi ubi ilu ọlu ala-ubi bu Ezri nwa Kelub:
27 onye-isi ubi-vine nile bu Shimai onye Rema: onye-isi nke ihe di n'ubi-vine itiye n'ulo nile anēdebe manya-vine bu Zabdi onye Shefam:
28 onye-isi osisi olive nile na osisi sycomore nile nke di n'ebe di ala ala bu Beal-hanam onye Geda: onye-isi ulo nile anēdebe manu bu Joash:
29 onye-isi ìgwè ehi nke nāta nri nime Sheron bu Shitrai onye Sheron: onye-isi ìgwè ehi nke di nime ndagwurugwu nile bu Shefat nwa Adlai:
30 onye-isi camel nile bu Obil onye Ishmael: onye-isi inyinya-ibu nile bu Jehdeia onye Meronot:
31 onye-isi ìgwè ewu na aturu bu Jaziz onye Haga. Ndia nile bu ndi-isi àkù nke Devid nwere.
32 Jonatan nwa-nne nna Devid bu onye nādu ọdu, nwoke nwere nghọta na ode-akwukwọ ka ọ bu: Jehiel nwa Hakmoni nọye-kwa-ra umu-ndikom eze: