1 Umu-ndikom Juda; Perez, na Hezron, na Kami, na Hua, na Shobal.
2 Reaia nwa-nwoke Shobal we mua Jahat; Jahat we mua Ahumai na Lahad. Ndia bu ab͕uru ndi Zọra.
3 Ndia bu kwa umu-ndikom nna Etam; Jezreel, na Ishma, na Idbash: aha nwa-nne-ha nwayi bu Hazelelponi:
4 na Penuel nna Gedoa, na Iza nna Husha. Ndia bu umu-ndikom Hua, bú ọkpara Efrata, nna Bet-lehem.