10 Ma n'ubọchi Sọl ha busoro ndi Haga agha, ndi dara n'aka-ha: ha we biri n'ulo-ikwū-ha n'elu ala nile nke ọwuwa-anyanwu Gilead.
11 Umu Gad biri kwa na ncherita-iru ha, n'ala Beshan rue Saleka:
12 Joel, bú onye-isi, na Shafam, bú nke-abua, na Janai, na Shefat nime Beshan:
13 na umu-nne-ha ndikom nke ulo nke ndi bu nna-ha; Maikael, na Meshulam, na Sheba, na Jorai, na Jakan, na Zia, na Iba, asa.
14 Ndia bu umu-ndikom Abihail nwa Huri, nwa Jaroa, nwa Gilead, nwa Maikael, nwa Jeshishai, nwa Jahdo, nwa Buz;
15 Ahi nwa Abdiel, nwa Guni, bú onye-isi ulo nke ndi bu nna-ha.
16 Ha we biri na Gilead nime Beshan, na n'ime-obodo-ya, na n'ebe-ita-nri nile nke Sheron, rue ọpupu nile ha.