3 umu-ndikom Reuben ọkpara Israel; Hanok, na Palu, na Hezron, na Kami.
4 Umu-ndikom Joel; Shemaia nwa-ya, Gog nwa-ya, Shimai nwa-ya;
5 Maika nwa-ya, Reaia nwa-ya, Beal nwa-ya;
6 Beera nwa-ya, onye Tilgat-pilnesa, bú eze Asiria, mere ka ọ je biri n'ala ọzọ: onye ahu bu onye-isi ndi Reuben nwere.
7 Na umu-nne-ya ndikom dika ab͕uru nile ha si di, mb͕e edere akwukwọ-osuso-ọmumu nke osuso-ọmumu nile ha; onye-isi, bú Jeiel, na Zekaraia,
8 na Bela nwa Azaz, nwa Shema, nwa Joel, onye ahu bi n'Aroea, we rue Nebo na Beal-meon:
9 ma n'ọwuwa-anyanwu o biruru nbata ọzara, bú site n'osimiri Yufretis: n'ihi na anu-ulo-ha bara uba n'ala Gilead.