13 Shalum mua Hilkaia, Hilkaia mua Azaraia;
14 Azaraia mua Seraia, Seraia mua Jehozadak;
15 Jehozadak we je mb͕e Jehova mere ka Juda na Jerusalem je biri n'ala ọzọ n'aka Nebukadneza.
16 Umu-ndikom Livai; Giashom, na Kohat, na Merari.
17 Ma ndia bu aha umu-ndikom Giashom; Libni, na Shimai.
18 Umu-ndikom Kohat bu Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel.
19 Umu-ndikom Merari; Mahli na Mushi. Ndia bu ab͕uru Livai dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.