26 Ma Elkena: umu-ndikom Elkena; Zofai nwa-ya, na Nehat nwa-ya;
27 Elaiab nwa-ya, Jeroham nwa-ya, Elkena nwa-ya.
28 Umu-ndikom Samuel kwa; ọkpara-ya, bú Joel, na nke-abua, bú Abaia.
29 Umu-ndikom Merari; Mahli, Libni nwa-ya, Shimai nwa-ya, Uza nwa-ya;
30 Shimea nwa-ya, Hagia nwa-ya, Asaia nwa-ya.
31 Ndia bu kwa ndi Devid guzoro dika ndi-isi akuku abua nke ndi-ọbù-abù nke ulo Jehova, site na mb͕e ib͕e Chineke zuru ike.
32 Ha we nēje ozi n'iru ebe-obibi ulo-ikwū nzute n'abù, rue mb͕e Solomon wuru ulo Jehova nime Jerusalem: ha we guzo n'ibu ndi-isi òfùfè-ha dika ikpe ekpere ha si di.