44 Umu-ndikom Merari, bú umu-nne-ha, nọ kwa n'aka-ekpe: Itan nwa Kishi, nwa Abdi, nwa Maluk;
45 nwa Hashabaia, nwa Amazaia, nwa Hilkaia;
46 nwa Amzi, nwa Bani, nwa Shemea;
47 nwa Mahli, nwa Mushi, nwa Merari, nwa Livai.
48 Enye-kwa-ra umu-nne-ha, bú ndi Livai, ifè òfùfè nile nke ebe-obibi ulo Chineke.
49 Ma Eron na umu-ya ndikom nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, na n'elu ebe-ichu-aja nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, bayere ije-ozi nile nke ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, na ikpuchiri Israel nmehie-ha, dika ihe nile si di nke Moses, bú orù Chineke, nyere n'iwu.
50 Ndia bu kwa umu-ndikom Eron; Eleeza nwa-ya, Finehas nwa-ya, Abishua nwa-ya;