46 nwa Amzi, nwa Bani, nwa Shemea;
47 nwa Mahli, nwa Mushi, nwa Merari, nwa Livai.
48 Enye-kwa-ra umu-nne-ha, bú ndi Livai, ifè òfùfè nile nke ebe-obibi ulo Chineke.
49 Ma Eron na umu-ya ndikom nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, na n'elu ebe-ichu-aja nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, bayere ije-ozi nile nke ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, na ikpuchiri Israel nmehie-ha, dika ihe nile si di nke Moses, bú orù Chineke, nyere n'iwu.
50 Ndia bu kwa umu-ndikom Eron; Eleeza nwa-ya, Finehas nwa-ya, Abishua nwa-ya;
51 Buki nwa-ya, Uzi nwa-ya, Zerahaia nwa-ya;
52 Meraiot nwa-ya, Amaraia nwa-ya, Ahaitub nwa-ya;