49 Ma Eron na umu-ya ndikom nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, na n'elu ebe-ichu-aja nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, bayere ije-ozi nile nke ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, na ikpuchiri Israel nmehie-ha, dika ihe nile si di nke Moses, bú orù Chineke, nyere n'iwu.
50 Ndia bu kwa umu-ndikom Eron; Eleeza nwa-ya, Finehas nwa-ya, Abishua nwa-ya;
51 Buki nwa-ya, Uzi nwa-ya, Zerahaia nwa-ya;
52 Meraiot nwa-ya, Amaraia nwa-ya, Ahaitub nwa-ya;
53 Zedok nwa-ya, Ahimaaz nwa-ya.
54 Ma ndia bu ebe-obibi-ha dika ebe-ulo-ikwū nile ha si di n'ókè-ala nile ha: enyere umu Eron, bú ab͕uru ndi Kohat, n'ihi na ha nwere ife-nzà mbu,
55 ha we nye ha Hebron n'ala Juda, na ebe-ita-nri-ya nile buruburu ya;