50 Ndia bu kwa umu-ndikom Eron; Eleeza nwa-ya, Finehas nwa-ya, Abishua nwa-ya;
51 Buki nwa-ya, Uzi nwa-ya, Zerahaia nwa-ya;
52 Meraiot nwa-ya, Amaraia nwa-ya, Ahaitub nwa-ya;
53 Zedok nwa-ya, Ahimaaz nwa-ya.
54 Ma ndia bu ebe-obibi-ha dika ebe-ulo-ikwū nile ha si di n'ókè-ala nile ha: enyere umu Eron, bú ab͕uru ndi Kohat, n'ihi na ha nwere ife-nzà mbu,
55 ha we nye ha Hebron n'ala Juda, na ebe-ita-nri-ya nile buruburu ya;
56 ma ha nyere Keleb nwa Jefune ọhia obodo ahu, na obodo ntà ya nile.