63 Enyere umu Merari, dika ab͕uru nile ha si di, site n'ebo Reuben, site kwa n'ebo Gad, site kwa n'ebo Zebulun, obodo iri na abua n'ife-nzà.
64 Umu Israel we nye ndi Livai obodo ndia na ebe-ita-nri-ha.
65 Ha we nye obodo ndia, nke ha kpọrọ aha, site n'ebo umu Juda, site kwa n'ebo umu Simeon, site kwa n'ebo umu Benjamin, n'ife-nzà.
66 Ma ufọdu nime ab͕uru umu Kohat nwere obodo ókè-ala nile ha site n'ebo Efraim.
67 Ha nyere ha obodo nb͕abà, bú Shekem na ebe-ita-nri-ya nile n'ugwu Efraim; Gezea kwa na ebe-ita-nri-ya nile;
68 na Jọkmeam na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-horon na ebe-ita-nri-ya nile;
69 na Ajalon na ebe-ita-nri-ya nile, na Gat-rimon na ebe-ita-nri-ya nile: