72 site kwa n'ebo Isaka; Kedesh na ebe-ita-nri-ya nile, na Daberat na ebe-ita-nri-ya nile;
73 na Remot na ebe-ita-nri-ya nile, na Anem na ebe-ita-nri-ya nile:
74 site kwa n'ebo Asha; Mashal na ebe-ita-nri-ya nile, na Abdon na ebe-ita-nri-ya nile;
75 na Hukok na ebe-ita-nri-ya nile, na Rehob na ebe-ita-nri-ya nile:
76 site kwa n'ebo Naftali; Kedesh nime Galili na ebe-ita-nri-ya nile, na Hamon na ebe-ita-nri-ya nile, na Kiriataim na ebe-ita-nri-ya nile.
77 Enyere umu Merari, bú ndi fọduru nime ndi Livai, site n'ebo Zebulun, Rimono na ebe-ita-nri-ya nile, na Teboa na ebe-ita-nri-ya nile:
78 enye-kwa-ra ha n'ofè Jọdan n'akuku Jeriko, n'akuku ọwuwa-anyanwu Jọdan, site n'ebo Reuben, Beza n'ọzara na ebe-ita-nri-ya nile, na Jahza na ebe-ita-nri-ya nile,