77 Enyere umu Merari, bú ndi fọduru nime ndi Livai, site n'ebo Zebulun, Rimono na ebe-ita-nri-ya nile, na Teboa na ebe-ita-nri-ya nile:
78 enye-kwa-ra ha n'ofè Jọdan n'akuku Jeriko, n'akuku ọwuwa-anyanwu Jọdan, site n'ebo Reuben, Beza n'ọzara na ebe-ita-nri-ya nile, na Jahza na ebe-ita-nri-ya nile,
79 na Kedimot na ebe-ita-nri-ya nile, na Mefaat na ebe-ita-nri-ya nile:
80 site kwa n'ebo Gad; Remot nime Gilead na ebe-ita-nri-ya nile, na Mahanaim na ebe-ita-nri-ya nile,
81 na Heshbon na ebe-ita-nri-ya nile, na Jeza na ebe-ita-nri-ya nile.