1 Ma umu-ndikom Isaka; Tola, na Pua, na Jashub, na Shimron, anọ.
2 Umu-ndikom Tola kwa; Uzi, na Refaia, na Jeriel, na Jahmai, na Ibsam, na Shemuel, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, bú ndi nke Tola; ha bu ndi-dike bu dìnkpà n'osuso-ọmumu nile ha: ọnu-ọgugu-ha n'ubọchi Devid di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na-isi na ọgu iri.
3 Umu-ndikom Uzi kwa; Izrahia: umu-ndikom Izrahia kwa; Maikael, na Obadaia, na Joel, na Ishia, ise: ndi-isi ka ha nile bu.
4 Usu ndi nāpunara madu ihe nke usu-ndi-agha so-kwa-ra ha, n'osuso-ọmumu-ha, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, ha di orú nnù uzọ anọ na nnù iri: n'ihi na ha nwere ọtutu ndinyom na umu-ndikom.