12 Shupim kwa, na Hupim, bú umu Ia, na Hushim, bú umu Ahea.
13 Umu-ndikom Naftali; Jahaziel, na Guni, na Jiza, na Shalum, bú umu Bilha.
14 Umu-ndikom Manase; Asriel, onye nwunye-ya muru: (iko-ya nwayi, bú nwayi Eram, muru Makia nna Gilead:
15 Makia we luru nwunye n'etiti Hupim na n'etiti Shupim, aha nwa-nne-ya nwayi bu kwa Meaka;) aha nwa nke-abua bu kwa Zelọfehad: ma Zelọfehad nwere umu-ndinyom.
16 Meaka, bú nwunye Makia, we mua nwa-nwoke, o we kpọ aha-ya Peresh; aha nwa-nne-ya nwoke bu Sheresh; umu-ya ndikom bu Ulam na Rakem.
17 Umu-ndikom Ulam kwa; Bedan. Ndia bu umu Gilead, nwa Makia, nwa Manase.
18 Nwa-nne-ya nwayi, bú Hamoleket, we mua Ishhod, na Abieza, na Mahla.