21 na Zabad nwa-ya, na Shutela nwa-ya, na Eza, na Elead, ndi ndikom Gat, ndi amuru n'ala, b͕uru, n'ihi na ha ridatara ichiri anu-ulo-ha.
22 Efraim, bú nna-ha, we rue újú ọtutu ubọchi, umu-nne-ya we bia ikasi ya obi.
23 O we bakuru nwunye-ya, o we turu ime, mua nwa-nwoke, nna-ya we kpọ aha-ya Beria, n'ihi na ulo-ya di n'ọnọdu ọjọ.
24 Nwa-ya nwayi bu Sheera, onye wuru Bet-horon di n'okpuru, na nke di n'elu, na Uzen-sheera.
25 Refa bu kwa nwa-ya, na Reshef, na Tela nwa-ya, na Tahan nwa-ya;
26 Ladan nwa-ya, Amaihud nwa-ya, Elishama nwa-ya;
27 Nun nwa-ya, Joshua nwa-ya.