25 Refa bu kwa nwa-ya, na Reshef, na Tela nwa-ya, na Tahan nwa-ya;
26 Ladan nwa-ya, Amaihud nwa-ya, Elishama nwa-ya;
27 Nun nwa-ya, Joshua nwa-ya.
28 Ihe-onwunwe nile ha na ebe-obibi nile ha bu Bet-el na umu-obodo-ya, na n'akuku ọwuwa-anyanwu Naaran, na n'akuku Ọdida-anyanwu Gezea na umu-obodo-ya; na Shekem na umu-obodo-ya, rue Aza na umu-obodo-ya:
29 na n'akuku umu Manase, Bet-shean na umu-obodo-ya, Teanak na umu-obodo-ya, na Megido na umu-obodo-ya, na Doa na umu-obodo-ya. Nime ndia ka umu Josef nwa Israel biri.
30 Umu-ndikom Asha; Imna, na Ishva, na Ishvi, na Beria, na Sera, bú nwa-nne-ha nwayi.
31 Umu-ndikom Beria kwa; Heba, na Malkiel, onye ahu bu nna Biazait.