29 na n'akuku umu Manase, Bet-shean na umu-obodo-ya, Teanak na umu-obodo-ya, na Megido na umu-obodo-ya, na Doa na umu-obodo-ya. Nime ndia ka umu Josef nwa Israel biri.
30 Umu-ndikom Asha; Imna, na Ishva, na Ishvi, na Beria, na Sera, bú nwa-nne-ha nwayi.
31 Umu-ndikom Beria kwa; Heba, na Malkiel, onye ahu bu nna Biazait.
32 Heba we mua Jaflet, na Shoma, na Hotam, na Shua nwa-nne-ha nwayi.
33 Umu-ndikom Jaflet kwa; Pasak, na Bimhal, na Ashvat. Ndia bu umu Jaflet.
34 Umu-ndikom Shema kwa; Ahi, na Rohga, na Jehuba, na Eram.
35 Umu-ndikom Helem nwa-nne-ya kwa; Zofa, na Imna, na Shelesh, na Amal.