5 Umu-nne-ha kwa nke ab͕uru nile nke Isaka, ndi-dike bu dìnkpà, di orú nnù uzọ iri na nnù iri-na-asa na ọgu iri, edewo ha nile n'akwukwọ-osuso-ọmumu.
6 Umu-ndikom Benjamin; Bela, na Bekea, na Jediael, atọ.
7 Umu-ndikom Bela kwa; Ezbon, na Uzi, na Uziel, na Jerimot, na Iri, ise; ndi-isi ulo nke ndi bu nna, ndi-dike bu dìkpà; edewo kwa ha n'akwukwọ-osuso-ọmumu, ha di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na-ise na orú na iri na anọ.
8 Umu-ndikom Bekea kwa; Zemira, na Joash, na Elieza, na Elioenai, na Ọmri, na Jeremot, na Abaija, na Anatot, na Alemet. Ndia nile bu umu-ndikom Bekea.
9 Edewo kwa ha n'akwukwọ-osuso-ọmumu, dika osuso-ọmumu nile ha si di, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, ndi-dike bu dìnkpà, ha di orú nnù uzọ abua na nnù iri na ọgu iri.
10 Umu-ndikom Jediael kwa; Bilhan: umu-ndikom Bilhan kwa; Jeush, na Benjamin, na Ihud, na Keneana, na Zetan, na Tashish, na Ahishaha.
11 Ndia nile bu umu Jediael, dika ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha si di, ndi-dike bu dìnkpà, ha di orú nnù uzọ abua na nnù atọ, ndi nāpukuru usu-ndi-agha ibu agha.