12 Umu-ndikom Elpaal; Iba, na Misham, na Shemed; onye ahu wuru Ono na Lod, na umu-obodo-ya:
13 na Beria, na Shema; ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi bi n'Ajalon, ha onwe-ha mere ka ndi bi na Gat b͕alaga;
14 na Ahio, na Shashak, na Jeremot;
15 na Zebadaia, na Arad, na Eda;
16 na Maikael, na Ishpa, na Joha, bú umu-ndikom Beria;
17 na Zebadaia, na Meshulam, na Hizki, na Heba;
18 na Ishmerai, na Izlia, na Jobab, bú umu-ndikom Elpaal;