2 na Noha, bú nke-anọ, na Rafa, bú nke-ise.
3 Bela we nwe umu-ndikom; Ada, na Gira, na Abaihud;
4 na Abishua, na Neaman, na Ahoa;
5 na Gira, na Shefufan, na Huram.
6 Ndia bu kwa umu-ndikom Ihud: ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi bi na Geba, ha we me ka ha je biri na Manahat:
7 na Neaman, na Ahaija, na Gira, onye ahu mere ka ha je biri n'ala ọzọ; ọ mua Uza na Ahaihud.
8 Shaharaim we mua umu n'ọhia Moab, mb͕e o zilagasiri ha; Hushim na Baara bu ndinyom-ya.