19 Ma Shalum nwa Kora, nwa Ebiasaf, nwa Kora, na umu-nne-ya, nke ulo nna-ya, bú ndi Kora, bu ndi-isi ije-ozi òfùfè ahu, ndi-nche nbata-uzọ nile nke ulo-ikwū: ndi bu nna-ha buri ndi-isi ọmuma-ulo-ikwū Jehova, ndi-nche uzọ-nbata;
20 Finehas nwa Eleeza bu kwa onye-ndú-ha na mb͕e gara aga, Jehova nọyere ya.
21 Zekaraia nwa Meshelemaia bu onye-ọnu-uzọ-ama nke ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.
22 Ndia nile arọputara ibu ndi-ọnu-uzọ-ama nime nbata-uzọ nile di ọgu iri na iri na abua. Edere ndi ahu n'akwukwọ-osuso-ọmumu-ha n'obodo ntà ha, ndi ahu ka Devid na Samuel onye-ọhu-uzọ doro n'ọnọdu-ha, bú ọnọdu nke ndi kwesiri ntukwasi-obi.
23 Ndi ahu na umu-ha bu kwa ndi-isi ọnu-uzọ-ama nile diri ulo Jehova, bú ulo nke ulo-ikwū ahu, n'ihe-ndebe.
24 N'akuku anọ ka ndi-ọnu-uzọ-ama nọ, n'Ọwuwa-anyanwu, na n'akuku Ọdida-anyanwu, na n'akuku Ugwu, na n'akuku Ndida.
25 Ma umu-nne-ha, n'obodo ntà nile ha, nwe ibata kwa-ubọchi-asa site na mb͕e rue mb͕e, inọyere ha: