3 Solomon we gosi ya okwu-ya nile: ọ dighi okwu ọ bula ezonariri eze nke ọ nēgosighi ya.
4 Eze-nwayi Sheba we hu amam-ihe nile nke Solomon, na ulo nke o wuru,
5 na ihe-oriri nke table-ya, na nnọdu nke ndi-orù-ya, na nguzo nke ndi nējere ya ozi, na uwe-ha, na ndi-obu-ihe-ọṅuṅu-ya, na àjà-nsure-ọku-ya nke ọ nēsure n'ulo Jehova; mọ adighi kwa nime ya ọzọ.
6 O we si eze, Ezi-okwu ka okwu ahu bu nke m'nuru n'alam bayere okwu-gi nile, baye-kwa-ra amam-ihe-gi.
7 Ma ekweghm okwu ahu, rue mb͕e m'biara, anyam abua we hu ya: ma, le, egosighm nkera-ya: i tukwasiwo amam-ihe na idi-nma n'akukọ nke m'nuru.
8 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndikom-i bu, ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi-orù-gi ndia bu, ndi nēguzo n'iru gi mb͕e nile, ndi nānu amam-ihe-gi.
9 Ka Jehova, bú Chineke-gi, buru onye agọziri agọzi, Onye ihe-gi tọrọ Ya utọ, itiyekwasi gi n'oche-eze Israel: ọ bu n'ihi na Jehova huru Israel n'anya rue mb͕e ebighi-ebi ka O doro gi eze, ime ihe ekpere n'ikpe na ezi omume.