2 Elaija we je ime ka Ehab hu ya anya. Ma oké unwu ahu siri ike na Sameria.
3 Ehab we kpọ Obadaia, onye bu onye-isi ulo-ya. (Ma Obadaia nātu egwu Jehova nke-uku:
4 o we rue, mb͕e Jezebel bipuru ndi-amuma Jehova, na Obadaia chiri ọgu ndi-amuma ise, zo ha, ọgu ndikom abua na iri n'otù ọb͕à, were achicha na miri zùa ha.)
5 Ehab we si Obadaia, Jegharia n'ala, rue isi-iyi nile nke miri, ru kwa miri-iyi nile: eleghi anya ayi gāchọta ahihia, we me ka inyinya na inyinya mule di ndu, ka ayi we ghara ibipu anu n'anu-ulo-ayi.
6 Ha we kewara onwe-ha ala ahu igabiga nime ya: Ehab jere n'otù uzọ, nání ya, Obadaia je-kwa-ra n'uzọ ọzọ, nání ya.
7 Obadaia we nọ n'uzọ, ma, le, Elaija zutere ya: ọ mata ya, da kpue iru-ya n'ala, si, Ọ̀ bu gi bu nka, onye-nwem Elaija?
8 Ọ si ya, Mu ka ọ bu: je, si onye-nwe-gi, Le, Elaija abiawo.