5 Ehab we si Obadaia, Jegharia n'ala, rue isi-iyi nile nke miri, ru kwa miri-iyi nile: eleghi anya ayi gāchọta ahihia, we me ka inyinya na inyinya mule di ndu, ka ayi we ghara ibipu anu n'anu-ulo-ayi.
6 Ha we kewara onwe-ha ala ahu igabiga nime ya: Ehab jere n'otù uzọ, nání ya, Obadaia je-kwa-ra n'uzọ ọzọ, nání ya.
7 Obadaia we nọ n'uzọ, ma, le, Elaija zutere ya: ọ mata ya, da kpue iru-ya n'ala, si, Ọ̀ bu gi bu nka, onye-nwem Elaija?
8 Ọ si ya, Mu ka ọ bu: je, si onye-nwe-gi, Le, Elaija abiawo.
9 Ọ si, Gini ka m'mehieworo, na gi onwe-gi nēnye orù-gi n'aka Ehab, ime ka m'nwua?
10 Jehova, bú Chineke-gi, nādi ndu, ọ dighi mba ma-ọbu ala-eze ma-ọli, ebe onye-nwem nēzigaghi ichọ gi: ma mb͕e ha siri, Ọ nọghi n'ebe a, o me ka ala-eze ahu na mba ahu ṅua iyi, na ha achọtaghi gi.
11 Ma ub͕u a gi onwe-gi nāsi, Je, si onye-nwe-gi, Le, Elaija abiawo.